DOWE IHE NIILE SEE IHE
Ka anyị see ụmụ nnụnụ
Lee ụfọdụ ụmụ nnụnụ a na-enweta na nka ndị Africa

Nnụnụ Baga osisi a pịrị apị si obodo Guinea

Nnụnụ hoopoe e ji bidi mee si South Africa

Nnụnụ cockerel e ji ígwe kpụọ si obodo Nigeria.
Lee ọmarịcha nnụnụ ndị a bi na mmiri ma ọ bụ n’akụkụ mmiri. Oge n’adịghị anya, a ga-achọ nnụnụ ndị a achọ maka unyi na mmerụ na-emebisi nri ha na ebe obibi ha.

Nnụnụ fish eagle

Nnụnụ Flamingo

Nnụnụ African Pygmy Goose
Lee ụmụ anụmanụ na ụmụ nnụnụ nọ gburugburu gị. Ọdịdị ọtụtụ ihe dị gburugburu. Ọ bụrụ na i nwere ike ise ihe dị gburugburu, i nwere ike ise ụmụ nnụnụ! Dịka i na-eme ihe, ị ga na-amụtakwu ka e si eme ya nke ọma. Bụrụ ụzọ see ọdịdị ndị dị mfe.

Bido ịmụ ka e si ese ihe gbagọrọ agbagọ.

Lee ma ị nwere ike ise ọdịdị gburugburu dị ụdị dị iche iche, ma nke dị n’ime onwe ha.

Ugbu a, lee ma i nwere ike ise ọdịdị oval na spiral.

Lee ma i nwere ike ise nku na abụba dị n’elu onwe ha.

Were ọdịdị dị mfe see nnụnụ nọ n’ọnọdụ dị iche iche.
Ugbu a, ị mụtala ya!



Nwebisiinka Alakija