ỤLỌ NGOSI NKA

Mmiri gị ọ dị ọcha n’eziokwu? Nke a bụ mmiri a gbatara na pomp, nke e ji igwe mikroskope nyochaa.

Nwebisiinka Robert Owen Lehman Collection, Courtesy Museum of Fine Arts, Boston

Ihe nka igwe si Benin na Nigeria ihe dịka afọ 1750. Ihe nka igwe a bụ otu n’ime ọrụ nka karịrị puku e jiri chọọ ụlọ eze mma, n’alaeze Benin.

Nwebisiinka Maurice Fiévet

Maurice Fiévet, onye mba France biri ndụ site na 1915 ruo 1997 gagharịrị njem na mpaghara Africa niile, na-ese ndị o zutere.

Ọrụ nka a kpọrọ “Fishermen in the Niger Delta”

Nwebisiinka Joana Choumali

Joana Choumali bụ onye mba Côte d’Ivoire. Ọ na-ese foto, ma werekwa ihe a kpara akpa na-akọ akụkọ. I were ihe karịrị otu ụzọ kọọ akụkọ, a na-akpọ ya ‘mixed media’.

Nwebisiinka “All Fingers Are Not Equal”. Victor Ekpuk. Nigeria, 2009.

Victor Ekpuk bụ onye Nigeria. Ọ na-eji akara edemede e mepụtara mgbe gboo ndị a na-akpọ Nsibidi na Uli, nke si na Ọwụwa Anyanwụ Nigeria akọ akụkọ.

Ọrụ nka a kpọrọ ” Another Fisherman’s story”.

Nwebisiinka Samatha Reinders

N’obodo Ghana, mmadụ nwụọ a na-akwa ozu ha rụpụta igbe ozu na-egosi ihe onye ahụ mere mgbe ọ dị ndụ.

Kedụ nka masịrị gị karịa n’ime ndị a niile? Ugbu a, ị ga-arụpụta nka nke gị na-egosi ‘Bellyful’.