ESERESE NKEJI ISE KWA ỤBỌCHị
Ngwakọta mara mma
Anyị ga-akwụsị itufu unyi n’ime ụzọ mmiri anyị. Oge n’adịghị anya, mkpọ plastik dị na mmiri anyị ga-akarị azụ dị n’ime ya. Nke ahụ mee gịnị ka anyị ga-erizi? A na-achọpụta ụmụ nnụnụ na ụmụ anụmanụ nwụrụ anwụ unyi dị n’afọ. Nnukwu azụ a na-akpọ enyi mmiri buru ibu: ị ga-amazị nnukwu unyi ha na-elo kwa ụbọchị.


Mkpọ plastik ruru 100kg dị n’ime afọ nnukwu azụ a.

See akara n’etiti ha n’otu n’out.
Kaa akara sentimeta abụọ na anọ site n’otu akụkụ gaa n’akara a dị n’etiti.

See ihe osise anọ. Akụkụ ha ga-adịrịrị n’akụkụ ihe ị sere na mpụta.
Gịnị dị n’ime afọ ha? Afọ ha ga-adịrịrị n’akụkụ akara dị n’etiti.

Site n’akara dị n’etiti chapụta ihe osise gị.
Kpakọtaa ihe osise gị rụpụta ihe osise ndị ọzọ mara mma.