Ị GA-EMENWUKWA YA
Azụ mara mma
Ọ bụ ndị ọrụ nka na Benin Republic rụpụtara azụ ndị a mara mma. E ji ihe emeghariri emeghari rụpụta ha.
Ị ga-emenwukwa ya!

Naanị ihe ị ga-eweta bụ:
- Akpa plastik
- Akwụkwọ e tufuru etufu
- Akwụkwọ a chapụtara achapụta
- Sizọs
- Glu

1. Chaa akpa plastik e tufuru etufu mkpirisi mkpirisi kpakọtaa ya ka ọ dị ka eriri.

2. Ị ga-eweta mpempe akwụkwọ e tufuru etufu i ji rụpụta ọdịdị azụ gị.

3. Pịajie mpempe akwụkwọ ndị ahụ ụzọ abụọ.

4. See ọkara ọdịdị azụ ebe ị piajiri

5. Bido ịchaputa ya!

6. Mepee ya hụ azụ gị mara mma

7. Were akwụkwọ ọzọ mepụta ọdịdị ga-adị ka azụ akwụkwọ gị.

8. Ugbu a rụpụta anya.

9. Nyado azụ gị mara mma n’elu eriri gị
Kedụ ka azụ gị mara mma dị?