Ị GA-EMENWUKWA YA
Mgbute aṅụrị
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọkụ azụ gịnị ka ị ga-achọ ịchọta n’ọkụ azụ gị? Chegodu gbasara otu okpuru mmiri ga-adị. Gịnị ka ị ga-ahụ? Azụ, mkpọ plastik ka ọ bụ Mami wata? Ka anyị rụpụta ihe dịka ụlọ azụ na-egosi ihe i che ga-adị n’okpuru mmiri.

Ị ga-eweta:
- Akpati akwụkwọ ochie
- Akwụkwọ e ji ede ihe
- Glu
- Sizos
E ji akwa chọọ akpati a mma n’ime ya. I nwere ike ite ime ya agwa.

1. See ọdịdị ụfọdụ ihe i che na i nwere ike ịhụ n’okpuru mmiri. I jiri mkpịsị odee buru ibu na nke dị gịrịgịrị see ya, ihe osise gị ga-adị ezigbo mma. Were mkpịsị odee nke buru ibu see gburugburu ya, werezie nke dị gịrịgịrị sepụta ime ya.

2. Chapụta ọdịdị gị mepụta azụ ‘cabodu’ ị ga-etinye n’azụ ha n’otu n’otu

3. Konye ‘azụ ị kụtara’ n’ime ụlọ azụ gị.
