ZUTE ONYE ỌRỤ NKA
Agostino Moreira de Melo

Agostino Moreira de Mélo bụ onye Brazil.
Ọ na-eji ihe ndị ọ chọpụtara arụpụta ihe ọhụrụ mara mma.


Ihe ndị a dịka okoso, mana e ji okwuchi ololo na okwuchi mkpọ plastik rụpụta ha. Ị gbatụla okoso mbụ? Ị ga-akpachara anya mee ya ma ọ bụghi ya ọ gaghị agba.
Agnostino bụ onye ihe ọ bụla gbasara ichekwa ala na-amasị. Ọ na-eji ọrụ nka ya eme ka anyị chee maka ndị anyị bụ.


“Mandala”
Mandala bụ ihe osise ọtụtụ ndị mmadụ gburugburu ụwa niile na-eji enyere onwe ha aka idozi uche ha. Ọtụtụ oge, mandala na-adị gburugburu. Mandala niile nwere etiti ebe a na-elekwasị anya.
Chegodu gbasara ihe na-eme ma ihe danye n’ime mmiri, gị a na-ele anya dịka ihe yiri akara na-agbapụta n’elu mmiri.
Agostino ga-achọ ka anyị mụta ka e si ele ihe anya n’ụzọ dị iche, ma jụọ onwe anyị ma anyị bụkwa ihe anyị chọrọ ịbụ.

