KỌỌRỌ M AKỤKỌ GỊ
Akụkọ Scrabble

O nwere ọtụtụ ihe ndị i nwere ike iji okwuchi ololo eme. Bido n’atụtụ ha!

Kpakọọ ọtụtụ okwuchi bottle. Were agwa a na-ete n’ahụ ụlọ ma ọ bụ agwa a na-ete na mvọ aka see mkpụrụ edemede n’elu okwuchi ololo ndị ahụ. I nweta ọtụtụ mkpụrụ edemede i nwere ike bido igwu egwuregwu.

Ihe ị ga-eweta bụ:

  • Mkpụrụedemede e dere n’okwuchi ololo
  • Enyi gi

Gị na enyi gị were mkpụrụ edemede ndị a e dere na okwuchi ololo deputa mkpụrụokwu niile unu nwere ike ide. Nye onwe gị oge i ga-eji mechaa ya!

Nwebisiinka Ijeoma Okoye
Nwebisiinka Polly Alakija

Kedụ egwuregwu ndị ọzọ i nwere ike iji okwuchi ololo gwuo?