KỌỌRỌ M AKỤKỌ GỊ
Pịa ya, pịa ya ka ọ pụta

Mee ka azụ akwụkwọ gị chewe ihu n’elu, pịa ya site n’otu akụkụ ruo akụkụ nke ọzọ. Mepee ya ọzọ.

Ị ga-ahụzị nnukwu akara X pianyere n’akwụkwọ gị.

Pịa nkoro akwụkwọ ka ọ gaa n’etiti.

Ị na-apịa ya, ọ ga na-adị obere.

Tụgharịa azụ akwụkwọ gị

Pịa nkoro akwụkwọ ka ọ gaa n’etiti.

Dịka ị na-apia ya, ọ ga na-adikwu obere.

Pịa akwụkwọ gị ụzọ abụọ mepee ya n’akụkụ abụọ.

Tụgharịa azụ ya.

Tinye aka gị n’okpuru wepụta nkoro dị na mpụta ka ha bịa n’etiti.

Otu e si egwu egwuregwu a:

1. Jide ọkọọ akụkọ n’aka gị, gwa enyi gị họrọ otu eserese n’ahụ ọkọọ akụkọ. Kpọpụta eserese ị họpụtara. Mepee Ọkọọ akụkọ mechie ya ọzọ. Ị ga-eme nke a na mkpụrụ okwu niile dị n’okwu ahụ. Nke a bụ mbido akụkọ.

2. Gwa enyi gị họrọ ọnụ ọgụgụ abụọ ọ na-ahụ n’ime. Gbakọọ ọnụọgụgụ abụọ ahụ ọnụ. Mepee ọkọọ akụkọ mechie ya ugboro ole ị gbakọtara n’ọnụ. Ọnụọgụgụ a ga-adiriri n’akụkọ gị.

3. Enyi gị ga-ahotariri ọnụọgụgụ ọzọ.

4. Mepee nkoro ọkọọ akụkọ nke dị n’okpuru ọnụọgụgụ a lee ihe eserese dị ebe ahụ. Ihe eserese ndị ị na-ahụ ebe a ga-abụ ngwụcha akụkọ a.

MEE ONWE GỊ OBI ỤTỌ!

Download and Do!

FCI Five Cowries Online My Story of Water 'Download and Do' Icon
Nwebisiinka Polly Alakija

I nwere ike biputa ọkọọ akụkọ gị ebe a, ma ọ bụ see nke gị.