NUTS NA BOLTS
Olee otu e si eme ya?

Onye sayensị akwa Ankara!

Akwa ANKARA na-amasị anyị niile. Ọdịdị ya emeghariri emeghari na-akọ akụkọ oge ụfọdụ, na-enye anyị obi ụtọ.

Gịnị ka i nwere ike ịhụ na ọdịdị ndị a?

Ụfọdụ unyi na-ese na mmiri, ụfọdụ na-emi emi.

Ka anyị chọpụta ihe na-eme ụzọ mmiri anyị ma anyị tunye unyi anyị n’ime olulu, iyi na osimiri.

Ị ga-eweta:

Ololo plastik e tufuru etufu

Mmiri

Ihe dị iche iche: mmanụ, aja, osikapa, agwa, mpempe plastik, dgz.

1. Gbajuo ololo gị mmiri

2. N’ime ololo ọbụla, tinye ihe dị iche. Gwakọtaa ya!

3. Gịnị na-ese na mmiri? Gịnị na-emi emi? Gịnị na-akwughari na mmiri?

4. See ihe ị chọpụtara

5. Were ihe ị chọpụtara mee ọdịdị nwere usoro

6. See ọdịdị nwere usoro n’azụ

7. Tee ya agwa. I bụrụla onye sayensị akwa ankara!