NTU NA IGODO
Maka Gịnị?
Gịnị mere ncha ji achụpụ nje?

I ga-eweta:
Mmiri
Ose ọkpọọ a kwọrọ akwọ
Ncha e ji asa efere
Mkpisi odee na akwụkwọ

1. Tinye obere mmiri n’ime efere gị.

2. Fesa ose n’elu mmiri. Ị na-ahụ ka o si ese n’elu mmiri?Ọ bụ maka o nwere ike dị n’elu mmiri na-eme ka o see n’elu.
3. Tinye mkpịsị aka gị n’ime efere mmiri na ose. O nwere ihe mere? Ka e were ya na aghịrịgha ose ndị ahụ bụ nje.O nwere ụfọdụ aghịrịgha ose nyadoro gị n’aka?

4. Ugbu a, tinye aka gị n’ime ncha tighachizie ya n’ime mmiri.
5. Gịnị mere oge a mgbe I tinyere aka gị ncha dị n’ime mmiri? Ncha chụpụrụ nje ose! Ncha na-ebelata ike di n’elu mmiri, nke mere o ji nwee ike ịchụ nje. Ya mere I kwesiri I na-eji NCHA akwọ aka gị oge niile!


Ndị ọka mmụta sayensi na injinịa niile ma ọrụ na-edetu ihe ha chọpụtara na nnwale ha.I nwere ike ise eserese na-egosipụta nnwale ncha gị?

Lee nnukwu eserese aka, ncha, na nje. Kedu ka ihe eserese nke gị ga-adị ?