EBE NGOSI ỌRỤ NKA
Dịka afọ na-aga, a na-eji anụmanụ emepụta ọrụ nka inyere aka zisaa ozi. Ọ bụrụ na mmadụ nwee eserese ọdụm ma ọ bụ nke anụmanụ a na-akpọ rhinoceros n’ụlọ ya, gịnị ka eserese a na-ekwu gbasara onye ahụ? Ọ bụrụ na mmadụ nwee eserese oke ma ọ bụ idide n’ụlọ ya, gịnị ka ọ na-ekwu maka onye ahụ?
N’ọgbọ 21st century, ọtụtụ anụmanụ fọdụziri ntakịrị n’ụwa. Ndị nka na-akwado nchekwa ụwa na-egosipụta ha na ọrụ ha.

Agụ abụọ e ji igwe bronze kpụọ na ọgbọ 16th Century, nke si Benin, Nigeria. Agụ igwe bronze dị otu a na-echebu ihu ụlọ eze ndị obodo Benin mgbe gboo.

Okpu eze ndị ala Yoruba e mepụtara na ọgbọ 20th century. Bidi e ji ihe nkụwa mepụta dịbu oke ọnụ ahịa. Gịnị ka ị che na enyi na ugo na-egosipụta?

Eserese ahụ ụlọ nke CALDER sere na Cape Town, n’obodo South Africa. Ọ bụrụgodu obere ụlọ, e nwere ike ise anụmanụ kacha nnukwu n’elu ya!

“Rhinocerous” nke William Kentridge sere n’obodo South Africa n’afọ 2019. Rhinocerous bụ anụ ọhịa siri ike. Gịnị ka i che mere onye nka jiri see efere nri n’ọnụ ya?

“Heritage” nke Cai Guo-Qiang sere na Australia n’afọ 2013. Mmiri dị ọcha kwesịrị irute ma mmadụ ma anụmanụ.

Mkpọ “Bellyful” e sere n’Ijebu, na Nigeria n’afọ 2019.
Kedu anụmanụ ị ga-ahọrọ igosipụta onye ị bụ? Kedụ ka ị ga-esi egosipụta anụmanụ a? Ị kwadola ise, ite agwa na ịkpụ ihe? Ngwa, ka anyị bido!