GỊNỊ NA-EME EBE A?
I nwere ike iche otu obodo anyị dịbu na mbụ?


Ụlọ anọchiela Apịtị Mangrove.
“Face me I face you” bụ ihe anyị na-akpọ ụlọ ọtụtụ ezinaụlọ bikọrọ ọnụ ma birikwa n’ọnụ ụlọ chere ibe ha ihu. Dịka ọnụọgụgụ ndị mmadụ na-eto, dịka obodo anyị na-eju.

Lagos Island bụbu ala a na akọ ugbo bụrụkwa ebe ndị ọkụ azụ na ndị na-achụ nta agụ iyi bi. Oge gboo, ọ bụ ebe obibi anụmanụ a na-akpọ water buffalo.
Mgbe Nigeria si n’aka ndị ọchịchị mba Britain pụọ na 1960, ọnụọgụgụ ndị nọ na Lagos Island bụ nde iri anọ na ise. Ugbu a ọnụọgụgụ ndị bi na Lagos Island bụ nde narị abụọ. N’afọ 2050 ọ ga-abụ nde narị anọ. Ugbu a, nde mmadụ iri isii na atọ na mpaghara Nigeria niile enweghi mmiri dị ọcha. Ihe nke a pụtara bụ na mmiri dị ọcha na ala a na-akọ ugbo agaghị eru mmadụ niile aka. Ọ ga-adịkwa mfe ọrịa ife site otu ebe ruo ebe ọzọ.

Ihe osise a kpọrọ “Crocodile” na New York, nke onye na-ese ihe n’ahụ ụlọ a na-akpọ PANGOLIN sere.

Na mbụ, gburugburu Lagos, azụ na agụ iyi jupụtara na mmiri niile.


Ablade Glover bụ onye mba Ghana na-ese ihe na-eme na obodo anyị mmadụ jubigara oke. Ebe anyị nwere obodo ugbu a, anyị nweburu anụmanụ a na-akpọ water buffalo.
Iyi, mmiri na apịtị anyị niile kwesịrị ịbụ ebe obibi nye ụmụ anụmanụ dịka water buffalo, pygmy hippo, agụ iyi na enyi.



A ga-achọ ụfọdụ anụmanụ achọ oge na-adịghị anya. Nke a mee, gịnị ka anyị ga-eme? Mmadụ na anụmanụ dị onwe ha mkpa. Anyị ga-agba mbọ ikpuchite anụọhịa anyị n’aka ndị nta maka nke a ga-emekwa ka a chọọ ha achọ. Ọ bụrụ na anyị chọọ inwe ahụike ọ dị mkpa na anyị ga-echekwa gburugburu anyị na ebe obibi anụ ọhịa anyị.
