I NWEKWARA IKE IME YA
Azụ jellyfish!
Azụ jellyfish dị n’osimiri gburu gburu ụwa niile ruo afọ nde narị ise. Azụ jellyfish dị tupu anụmanụ a na-akpọ dinosaur apụta. Ọ bụ mmiri mejupụtara ahụ azụ jellyfish!

Dịka nde afọ na-aga, azụ jellyfish agbanwebeghi nnukwu. Ha enweghi nkuume ma ọ bụ ụbụrụ, ha enwedịghị ọbara! Ha bụ ụdị azụ sịrị ike site n’otu ahụ ha dị.

Azụ jellyfish na-agba nke ọjọọ. Ọnụọgụgụ azụ jellyfish na-agbago maka mgbanwe eluigwe.

Ọ dị mfe ịrụ ọdịdị azụ jellyfish ndị a. Sọọsọ ihe ị ga-eweta bụ ololo plastic ole n’ole na eri.


Copyright Polly Alakija
Ọ bụrụ na anyị elekọtaghi ala na gburugburu anyị ihe anyị ga-enwe n’ọdịnihu bụ mmiri ololo plastic na azụ jellyfish juru n’ime ya!