KA ANYI TEE AGWA
Joseph Cartoon bụ onye Kenya
Ọdịdị na-amasị Joseph
Oge ụfọdụ, ọ na-adị ka mmadụ na anụmanụ na-ezo n’eserese, ọ na-esi ike ịhụ ha oge ụfọdụ.


Oge ụfọdụ ndị ọrụ nka anaghị akpọ ọrụ ha aha. Ihe osise abụọ ndị a enweghi aha. Kedu aha ị ga-akpọ ha?
Ọtụtụ anụmanụ, nnụnụ na azụ na-enwe ọdịdị ozuzo ka a hapụ ihu ha. Nke a bụ otu ụzọ ha na-esi ekpuchite onwe ha. Ugbu a e nwere ọtụtụ ndị mmadụ n’ụwa, ohere adizighi ebe ụmụ anụmanụ ga-ebi ya mere anyị ga-enyekwa aka ikpuchite ha.


Ụfọdụ anụmanụ na azụ nwere ike ịgbanwe isi ha ka ha nwee ike kpuchie onwe ha. Azụ ndị a yiri coral dị ha gburugburu. Ha nwekwara ike ịgbanwe isi ha ka ha sie ka coral.
Biputa Mee!
Lee eserese Joseph abụọ I ga-ete agwa. I nwere ike itinye ọdịdị nke gị. I ga-enye anụmanụ na azụ gị ọdịdị nzuzo?