KỌỌRỌ M AKỤKỌ GỊ.
Dice akụkọ: Ebe a na Ugbu a
Kedụ ebe ị nọ ugbu a? Gịnị dị gburugburu gị? Kọwaa ihe ị na-ahụ.
Gịnị dị ebe a: otu izu ụka gara aga? Otu afọ gara aga? Afọ iri ise gara aga? Afọ narị abụọ gara aga? Otu ebe ị nọ dị, ọ bụ otu o na-adịbu na mbụ? Onye bi ebe ahụ tupu gị abịa? Enyi na enyi mmiri ha bi ebe ahụ? Ebe a ọ bụbu apịtị ka ọ bụbu ọhịa?

Mmiri mechiburu ọzara Sahara.

Timbuktu, Mali 1858
Gịnị ga-adị ebe a mgbe otu izu ụka gachara? Mgbe otu afọ gachara? Mgbe afọ iri ise gachara? Mgbe afo narị abụọ gachara? Onye ga-ebi ebe a oge ahụ? Ebe a ọ ga-aka mma? Ọ ga-enye ahụ ike na obi ụtọ karịa? Kedụ ụzọ I ga-esi mee ka ebe a dị mma?

Ebe e nwere ngwa ọrụ mmanụ na ụlọ ugbu a, ihe dịbu ya bụ apịtị na mmiri.

Ọ bụ ụzọ a ka anyị ga-esi biri na ọdịnihu?
1. See ọdịdị square na mpempe akwụkwọ buru ibu.
2. Dee otu afọ n’ime otu ọdịdị square. I nwere ike ide afọ gara aga na afọ dị n’ihu.

3. Rụọ dice abụọ, I nwere ike iji ndị a rụrụ arụ ebe a.
4. N’otu dice, see ụmụ anụmanụ.
5. Na nke ọzọ, dee ọnụọgụgụ
Biputa Mee!


6. Tụọ dice n’elu bọdụ were ya kọọ akụkọ gbasara afọ ọ dara n’elu ya na anụmanụ dị n’elu dice. Ọnụọgụgụ e dere na dice nke abụọ ga-agwa gị anụmanụ ole ị ga-enwe n’akụkọ gị.
