GỊNỊ NA-EME EBE A?

Kedu ngwa ọrụ ga-adị gị mkpa?

Kpakọtaa ihe ndị ụmụ gị ga-eji rụọ ihe. Ololo plastic, mpempe akwa, okwuchi ololo, eri, akwụkwọ ochie na akwụkwọ ozi.

Dowe ihe ndị a nke ọma n’ime mkpọ dị ọcha. Were mkpọ dị iche tinye ihe ọbụla ị na-atụtụkọta.

Nye ụmụ gị ute n’ala. Kpoo ute a ‘ute mmụta’.

Copyright Wasiu Quadri

Ụmụaka ndị a ji akwụkwọ abịrịka mere ‘ute mmuta’ ha.

.Nye umu gị ụbọchị na oge a kpọrọ aha ha ga na-eme ihe n’elu ‘ute mmuta’.

Ụmụaka ga-anọdụrịrị ala oge ha na-acha ihe. Atụkwala mmadụ ma ọ bụ ihe ọbụla sizọs .I jide sizọs, ‘ọnụ’ ya ga-adịrịrị n’aka gị

Ọ dị mma ma ọ bụrụ na ụmụ gị na-enye aka n’ụlọ, n’ugbo ma ọ bụ n’ahịa. Mee ka ụmụ gị detuo ihe niile ha na-eme n’ụlọ. Too ha ma akwụkwọ ndepụta ha ju.

Na-echetara ụmụ gị ka ha kwọọ aka ha tupu ha emee ihe ọbụla nakwa mgbe ha mechara ya.

Ọ bụrụ na I nwere akwụkwọ ọzọ, were ya mee akwụkwọ ndeputa nke ezinaụlọ . Kwa ụbọchị, gwa otu n’ime ndị ezinaụlọ gị dee ma ọ bụ see ihe mere ụbọchị ahụ . Ezinaụlọ niile nwere ike ime nke a!

Mee ndị ezinaụlọ gị obi ụtọ site n’isekọta osisi agbụrụ ezinaụlọ unu ọnụ.

Copyright Polly Alakija

BIPỤTA MEE