MKPARỊTA ỤKA COTONOU

Ndeewo StéphaneStéphane Bonjour!  

Stéphane si Cotonou. Stéphane na-asụ asụsụ French.

Copyright Poly Alakija

Ihe dịka nde mmadu nari na iri anọ n’ala Africa na-asụ asụsụ French na mba iri atọ na anọ. Asụsụ French batara n’ala Africa site n’aka ndị ọchịchị ndị ọcha. Cotonou bụ obodo kacha nnukwu na mba Benin Republic . Ọ dị n’etiti mmiri Atlantic Ocean na Lake Nokoue.

Copyright Gille C Photography

Ndị bi ebe a na-ata azụ nnukwu. Nri a na-eri na Benin na-atọ ka nri ndị Africa, nri ndị Brazil na nri ndị Europe. E nwere ike iji Moyo sauce, nke a na-eji tomato na ose eme taa azụ a hụrụ n’ọkụ. I nwekwara ike iri Ago Glain, ofe a na-eji azụ na nshịkọ esi, were akpụ rie.

Copyright IRD/C. Lévêque

Isi obodo Benin Republic bụ Porto Novo.

Na Porto Novo, o nwere ọtụtụ ụlọ ochie dịka ụlọ ndị Brazil, nke ndị obodo Africa si n’obodo Brazil lọta rụrụ.

Copyright Musa Jibril

O bidoro dịka ogbe ndị na-akụ azụ, mana bụrụzia ogbe azụmahia A na-erebu ndị ohu, mmanụ nkwụ na kọtin ebe a.

Copyright Happy Days Travel Blog