MKPARỊTA ỤKA
LAGOS : ÈKÓ
Ndeewo Timilayo! Ekaro Timilayo!
Timilayo na-arụ na Alliance Francaise nke dị na Lagos.

Timilayo na-asụ asụsụ YORUBA. Ọnụọgụgụ ndị na-asụ asụsụ Yoruba n’obodo Nigeria ma n’ụwa niile ruru nde iri ise na ise. Lagos dị nso etiti ụwa, ya mere ọ na-adị ọkụ afọ niile! Otu n’ime ọdọ ụgbọ mmiri kachasị ibu dị na Lagos. Ndị Yoruba ebiela ebe a kemgbe narị afọ iri na ise, Ndị si obodo dị iche iche na mpaghara Nigeria niile bi na Lagos, Ndị si West Africa, ma ndi ohu si obodo Brazil na West Indies lọta.
Nde mmadu iri abụọ na otu bi na Lagos. Aha ‘Lago’ pụtara ‘Lake’ n’asụsụ ndị Portugal. Ndị ahịa Portugal bịara Lagos na mbụ n’afọ 1470.Lagos ghọrọ ogbe azụmahịa ndị ohu a ma ama . Lagos ghọrọ obodo ndị mba Britain na-achị n’afọ 1862. Ọ ghọrọ isi obodo Nigeria, bụrụkwa isi obodo Nigeria mgbe ọchịchị ndị ọcha kwụsịrị n’afọ 1960. N’afọ 1991, isi ọchịchị Nigeria gara Abuja, mana Lagos ka bụ obodo isi azụmahịa na Nigeria ruo taa.

Ndị mmadụ gburugburu ụwa niile na-agba egwu afrobeat nke Fela Anikulapo Kuti, onye kụrụ egwu ya na ‘The Shrine’ na Lagos

Lee akara njirimara obodo ndị Lagos State.

Akara njirimara obodo nwere ike ịkọ akụkọ.
Okpu ọcha nke Keremesi na-egosipụta ndị ọchịchị ọdịnala Lagos state.

O nwere mgbe obodo Lagos bụ obodo ndị na-akụ azụ, akụkụ mmiri na okpokoro cowry. Dika ndi mmiri na akụkụ mmiri gbara gburugburu, a na-ejibu okpokoro cowry azụ ahịa.