MKPARỊTA ỤKA PORT HACOURT
Ndeewo Onyinye! Nnoo Onyinye!
Port Hacourt bụ isi obodo Rivers State.

Osimiri juru n’obodo Rivers!! Olundi di iche iche jukwara n’ime ya. A ma ya dịka obodo ire narị atọ. Site n’ịbụ ogbe ndị na-akụ azụ, Port Hacourt ghọrọ ogbe azụmahịa unyi mgbe ndị ọcha na-achị, bụrụzie ogbe azụmahịa mmanụ .Nke a pụtara na Port Hacourt ghọrọ nnukwu obodo.

I ka nwere ike ịhụ ụlọ ochie nke ndị ọcha biri oge ha na-achị na Port Hacourt.
Bole na Fish Meal bụ abịrịka ma ọ bụ ji a hụrụ n’ọkụ na azụ a hụrụ n’ọkụ. A na-eji mmanụ nkwụ etinyere ose eri ya. A na-aka eri ya na Port Hacourt dịka ihe ntagharị ọnụ ma ọ bụ nri site na emume a na-eme, ma ọ bụ ihe na-akụ n’ụbọchị.

Ọzọkwa, ụgbọ mmiri na-amasị mmadụ niile na Port Hacourt .N’ọnwa May, ndị nwere ụgbọ mmiri na-eme asọmpi na Port Hacourt Boat Regatta.

A ma Rivers State dịka obodo mmanwụ puku. N’ọnwa December niile na Port Harcourt, a na-enwe emume carnival kwa afọ. Mmadụ niile na-apụta icheta omenala obodo Rivers.
