NNỌỌ! EBE A BỤ FIVE COWRIES ONLINE
Gịnị ka anyị na-arụ?
Anyị nọ ebe a ịkwado gị, ịhụ na ọdịnihu gị ga-adị mma, ju afọ.


Lee ka anyị si eme ya….
Kedu nka ndị I kwesiri inwe ma ọ bụrụ na Ị chọrọ ịbụ onye nne, onye nna, onye nkuzi, onye ọrụ ugbo, onye matimatishan, ọka mmụta sayensi, injinia, onye na-emepụta ihe nkiri, ma ọ bụ odee akwụkwọ na-eme nke ọma, obi dị ụtọ?
Ihe ọ ga-ewe bu Ịrụkọta ọrụ, Ikwupụta okwu, Ichepụta ero na Iche ezigbo echiche .
Kedu ụdị mmadụ Ị ga-achọ ịbụ?
Ị ga-achọ ịmakụ OMENALA gị ịbụ ONYE OBI ỌMA, ka gị na ndị ogbe gị na-EKWURỊTA na-ANỌKỌ NKE ỌMA?
Ị ga-agwakọta okwu ndị a, were ha mee otu Ị chọrọ, mụta nka ọhụrụ, ma rụpụta ihe e ji mara sọọsọ gị. Ị ga-agwakọta okwu ndị a, were ha mee otu Ị chọrọ, mụta nka ọhụrụ, ma rụpụta ihe e ji mara sọọsọ gị.

Emume anyị niile bụ nke I nwere ike ime n’onwe gị, ma ọ bụ gị na ndị ezinaụlọ gị na ndị enyi gị emee ya.Ọ na-enye mmadụ niile obi ụtọ, n’agbanyeghi afọ ole ha dị.
O nweghi ụzọ dị mma ma ọ bụ ụzọ dị njọ e si eme emume anyị ndị a . Họpụta ndị ọbụla masịrị gị karịa, I nwere ike ime nke ọbụla ị chọrọ, oge ọbụla ị chọrọ.
Na Five Cowries anyị nwere otu iwu: mee ihe ga-enye gị obi ụtọ!
I NWERE IKE ỊRỤPỤTA IHE PỤRỤ ICHE?
Ị bụ Onye ya na mmadụ ibe ya na-arụkọ ọrụ nke ọma, Onye na-ajụ ajụjụ, Onye nwere ike ijide onwe ya, Onye na-echepụta ero ọhụrụ, na Onye ike anaghị agwụ ọsịsọ? Ndị ọbụla na-amụ ihe, n’agbanyeghi afọ ole ha dị, nwere ike ịjụ onwe ha ajụjụ ndị a.

I nwere ike ịrụpụta ọgba gburugburu nke gị dịka onye na-arụ ọrụ ma ọ bụ onye nkuzi, rụpụtakwa ọzọ maka ụmụaka nọ n’ogbe gị.

Were agwa tejuo mpaghara gburugburu na-egosipụta nka nrụpụta i nwere karịa. Mpaghara ole ka ị ga-eteju? Ogo nrụpụta gị ga-esi n’etiti gburugburu na-etoputa.
DETUO YA!
Gịnị na-akpali mmụọ gị? Kedu ihe I hụrụ, ihe I metụrụ aka, ihe I nụrụ isi ya ma ọ bụ ihe I deturu ire nyere gị ezigbo obi ụtọ?
Lee anya n’elu, legharịa anya gburugburu gị, malite idetu ya ..I nwere ike ime nke a site na ide ihe, ise ihe, ma ọ bụ ha abụọ Ndi nka, ndị ọkammuta sayensi, ndị dibia bekee niile na-ele anya, detuo ihe, jụọ ajụjụ, ma weputa azịza na-egbo mkpa.

Ị dịla njikere?
KA ANYỊ GAA!